Hosea 7

1mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel,
mmehie Ifrem na-apụta ihe,
a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria.
Ha na-aghọ aghụghọ,
ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ,
ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ.
2Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara
na m na-echeta mmehie ha niile.
Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu.
Ana m ahụkwa ha niile.

3“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha;
ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.
4Ha niile bụ ndị na-akwa iko;
ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ,
nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ,
site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.
5Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị,
ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke,
ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.
6Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha,
ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya.
Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ,
nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.
7Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ.
Ha na-eripịa ndị eze ha.
Ndị eze ha niile na-ada,
ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.

8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ.
Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.
9Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha,
ma ha adịghị aghọta ya.
Isi awọ apụtala ha nʼisi,
ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị.
10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya
ma nʼagbanyeghị ihe ndị a
ọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya,
maọbụ chọọ ya.

11“Ifrem dịka nduru
nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie,
ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt,
ma na-agbakwurukwa Asịrịa.
12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha,
dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe.
Aga m enye ha ahụhụ
nʼihi njehie ha niile.
13Ahụhụ na-adịrị ha,
nʼihi na ha ajụla m.
Ha na-ala nʼiyi
nʼihi na ha enupula isi ha megide m.
Achọrọ m ka m gbapụta ha,
ma ha na-agha ụgha megide m.
14Ha ejighịkwa obi ha akpọku m,
kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa.
Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya,
ha na-egbukasị onwe ha ahụ,
na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.
15Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike,
ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.
16Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu.
Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla.
Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha,
nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta.
Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị
nʼala Ijipt.
Copyright information for IboBIU